NDI NTOROBIA AHAPULA ỤLỌAKWỤKWỌ ILU DI NA ZIMBABWE

0
29

Ihe karịrị ndi ntorobia puku mmadu ano na nari iri ise ahapụla ụlọ akwụkwọ n’afo a, ma gaba ilu di na mba Zimbabwe,n’agbanyeghi iwu ulo ikpe nwere ka onye ọ bụla hara ilu di tupu o ruo afo iri na asato.
N’oge mkparita uka ya na ndi akwụkwo akuko Herald nke steti nwee,minister n’ahu maka agumakwukwo n’ogo primari na sekondiri bụ Lazurus Dokora mere ka amata na umuagbo di puku ato na nari isii na iri ise na ndi okorobia nari abuo na iri ise na otu gbapuru na ụlọ akwukwo sekondiri site na onwa Januwari ruo Novemba afo a
Ogbakwunwere na umuagbo nari ato na ise na ndi okorobia iri na ato gbapuru n’ụlọ akwụkwọ primari I gaa malite ezinaulo nke ha.Ufodu ndi gbapuru na ulo akwukwo I gaa luo di gara ebido akwụkwọ ma ha tolitekwuo.
Na mba Zimbabwe,umuaka kwesiri ibido akwụkwọ n’afo ise ma ọ bụ isii, mana otutu ndi nọọ n;ime ime obodo na amalite ka ha tolitesiri.
Ngwa nyocha n’ahu maka ihe di iche iche na mba Zimbabwe chopụtara na umuaka di ogo percent iri abuo na otu,tumadi umuagbo, n’alu di tupu ha eruo afo iri na asato n’ihi ubiam,omenala na okpukperechi.
Dokora siri na goomenti kwesiri igbasi mbo ike, ibuso agha maka ilu di na nwata ma kwusilata umuagbo ibanye alumdi na nwata.
‘Anyi ga-agbasi mbo ike igbaza ozi gburugburu ulo akwukwo anyi na ikwusilata umuaka,ndi nne na nna ha,na ndi nlekota ha igbara ilu di na nwata oso.’
Ala okpo nku nke El Nino mere n’afo 2015 ruo 2016 emela ka ihe diwanye njọ n’ufodu ime ime obodo,ebe ndi nne na nna n’enweghi umuanumanu ha n’ere, n’erepuzi umuaka ha na alumdi.
Amarachi Nwanguma

SHARE

ENWEGHI OZI

NYE NZAGHACHI NYE