TAA BỤ ỤBỌCHỊ TUUZDEE MA BỤRỤKWA AHỊA AFỌ, ABALỊ IRI NA ATỌ NKE ỌNWA DISEMBA AFỌ PUKU ABỤỌ NA IRI NA ISII. Chizoba Anuforom ONYEISIALA BUHARỊ GA- EKPEZI NSOGBU NTỤLIAKA E NWERE NA MBA GAMBIA

0
20

ONYEISIALA BUHARỊ GA- EKPEZI NSOGBU NTỤLIAKA E NWERE NA MBA GAMBIA

O kwuru na kansul ahụ etinyeghi ọnụ n’ ihe a ga- eme ma ọbụrụ na Jammeh anabataghi Onyeisiala  Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari so na ndiisi si mpaghara ọdịda anyanwụ mba Afrịka ga- eme njem na mba Gambia ụbọchị Tuuzdee, iji rịọ onyeisiala mba ahụ bụ Yahya Jammeh ka ọ nabata mmeri e meriri ya na ntụliakaelu onyeisiala.

Onyeisiala mba Sierra Leone bụ Ernest Koroma, John Mahama nke mba Ghana, onye nke dara ntuliaka onyeisiala mba ya ma bụrụkwa onyeisioche otu jikọrọ akụnụba mba ndi nọ n’ọdịda anyanwụ Afrịka nke a kpọrọ ECOWAS n’aha ichafụ bekee, sokwa na otu ga -eje mba Gambia, nke onyeisiala mba Liberia bụ Ellen Sirleaf ga- anọ n’isi ya.

Ha ga- akwanye onyeisi Jammeh ka ọ hụ na e nwere nnyefe ọchịchị n’aka onyeisi a họpụtara ọhụrụ bụ Adama Barrow.

Kansul nchekwa otu mba ụwa mere ka ndị nta akụkọ mata nke a oge ha mechara ọgbakọ ime obi nke mba iri na ise mejupụtara kansul ahụ gbasara ọnọdụ okwe ndọrọ ndọrọ e nwere na mba Gambia.

Osote onye nnochiteanya mba Spain bụ Maazị Juan Manuel De Linares kwuru na ndị kansul ahụ ekwekọrịtala na ozi ha weputara n’abali iri nke ọnwa Disemba ka Jammeh malite inyefe ọchịchị n’ aka Barrow na egbughi oge.

mkpezi ha.
Ọ rịọrọ otu niile nọ na mba Gambia ka ha gbanahụ ọgbaghara ma hụ na e nwere nnyefe ọchịchị n’ udo na mba ahụ.

Onye nnochiteanya mba Angola na otu mba ụwa bu Ambassador Ismael Martins kwuru na ihe e ji eme njem ahụ bụ ime ka onye ọbụla kwekọrịta na nnyefe dịka iwu otu jikọrọ mba Afrịka na ECOWAS si wee kwuo.

 

Kansul ahụ rịọkwara ndị mba ahụ ka ha dere duu ma kwalite nchekwa Barrow na nke ụmụafọ ha.

Kaosinadi Jammeh nabataburu mmeri oge ekwuputachara na ọ bụ Barrow meriri n’ abali mbụ nke ọnwa Disemba ma kwugharikwa na ụbọchị fraidee na ọ gaghị enyefe ọkwa ọchịchị.

Ntuliaka ahụ bu nke ga ewete ọchịchị Jammeh di afọ iri abuo na abuo bukwa nke otutu hutara dika ọchịchị mmegbu, n’ isi njedebe.

Ode akwukwo otu mba uwa bụ Ban Ki-moon, nọkwara n’ ozi ya rịọ Jammeh na ndị otu ya ka ha kwanyere etu okwe si gbaa na ntuliaka ahụ ugwu ma gbanahụ ọgbaghara.

Chizoba Anuforom

SHARE

ENWEGHI OZI

NYE NZAGHACHI NYE