Ala Naijiria adila njikere ihibe amụma ga emegide ụmụ ntakiri ịlu di n’oge.

0
29

Ala Naijiria adila njikere ihibe amụma ga emegide ụmụ ntakiri ịlu di n’oge dika  ọ dị na mkpebi ha nwere n’ọgbakọ ezumezu ndi isiala otu jikoro mba Afrika agba nke iri abụọ na ise ya, n’ọnwa Jun afọ puku abụọ na iri na ise.

Onye minista na- ahụ maka odimma ụmụ nwaanyi bụ Hajiya Aisha Alhassan kwuru na ala Naijiria ji  ya bụ amụma egosipụta idi uchu ha n’ikpochapu alumdi ụmụntakiri n’oge.

Alhassan kwuru na mba ndị nọ na mba Afrika na- agabiga ihe iche aka mgba umuntakịrị ịlu di n’oge bụ nke na- anapu ha inwe ezi ahuike, igụ akwụkwọ nakwa ezi odinihu.

O kwuru na nchọcha ụlọọrụ UNICEF mere gosiri na a na -alupu umuaka dị nde iri na ise n’ọnụọgụ  kwa afọ tinyere na nke a adighi mma maka odimma ha.

Onye minista a kwuru na mba Afrika dị iri na ise ehibego amụma ịkwụsị nwatakịrị ịlụ di n’oge.  Ha gụnyere  mba Ethiopia, Ghana, South Africa, Sierra Leone, Senegal, Niger, Islamic Republic ke Gambia, Malawi, Zimbabwe, Eritrea, Zambia, Chad, Burkina Faso , Mali nakwa mba Madagascar.

Alhassan gwara ụlọọrụ mgbasa ozi na ndị na -eweta mmepe ha na ha na-ejiko akaọnụ nakwa ndi nke a metụtara ka ha gbasie mbọ ike ịhụ na nwatakịrị nwaanyi nweere onwe ya n’ụdị alumdinanwunye nakwa arụ ndi ozo a na -eji emegide ụmụaka.

Oluoma

 

SHARE

ENWEGHI OZI

NYE NZAGHACHI NYE