Ala Naijiria eweputala usoro ọhụrụ eji ebuso mpụ agha

0
29

Gọọmenti ala naijiria agbahela amuma ọhụrụ eji ebuso mpụ agha,nke bụ   ‘ụmụnwanyi megide mpụ’’.Nwunye onye isi-ala bụ Aisa buhari gbahere amụma a na Abuja bụ isi obodo Naijiria.                                                   Okwuru mkpa ọdi bụ ụmụnwanyi inọ n’isi ibu agha megide mpụ site n’ụlọ ha,maka mkpa ha di na obodo.                                                             Oriaku Buhri gbakwuyere na ‘mgbanwe malitere ebe m nọọ’’bu nke ga amalite ebe m nọọ,ebe nwunye osote onye isi-ala nọọ,ebe ndi Naijiria nile nọọ.                                                                                                   Onye  jigodu ọkwa onye isi oche Economic and Financial Crimes Commission, EFCC,n’olu bekee bu mazi Ibramim Magu,  kwuru na amuma a “ụmụnwanyi megide mpụ”ọgbakọ a ka eguzobere iji kwado ụmụnwanyi ka ha tinye uchụ na agha megide mpụ.

Onye ọbia n’ihe omume a bụ,onye jibu ọkwa ọkikpe ụkwụ ala naijira, ọkikpe  Aloma Murktar , kpọkuru ndi ala anyi ka ha tinye aka ma kwado umunwanyi,iji nyere ha aka ka ha tinye oke ha na ọganihu ala anyi.

Onye Director General ụlọ ọrụ Voice of Nigeria bụ mazi Osita Okechukwu, kwere nwunye onye isi-ala nkwa na ụlọ ọrụ ya ga n’akwado ọchichi di ugbua na ibu agha megide mpụ.

“Na nke mbu na ala Naijiria,anyi nwere onye isi-ala na osote ya bụ ndi, ndi iro ṅyochagoro ma chọputara na aka ya di ọcha,tumadi mgbe oji ọkwa na ogige mmaṅu bu PTF n’aha ichafu.ihe ndia na egosi na nwamadi a anaghi eme mpụ ,” ka okwuru.

Okoloto “Umumnwanyi megide mpu ka nwunye onye isi-ala gbapere,nwunye osote onye isi-ala bu Dolapo Osinbajo na onye nisi oche  EFCC.

SHARE

ENWEGHI OZI

NYE NZAGHACHI NYE