Chief Nwodo aburula onye-isi Ohanaeze Ndigbo

0
12

Onye jibu okwa dika Minister n’ahu maka mgbasa ozi bụ Chief John Nwodo aburula onye isi gburu gburu nke itolu nke Ohanaze Ndigbo”

Nwodo bu onye eduru na iyi oru dika onwetara votu di nariabuo iri ano na abuo(242) oji mere okanmuta. Chiweyite Ejike bu onye nwetara votu iri na ato(13).

In his acceptance speech after the election, Nwodo said that he would reposition Ohanaeze to bring more development to Ndi-Igbo and Igboland.

“Agam ahu na m ga eweta onodun kwu chim na ihe obula gbasara Ohanaeze.

“M nan di otu m ga arukọ ọrụ ọnụ ihu na anyi chikọtara mpaghara South-East ọnụ ma weghachi  Enugu dika isi obodo  South-East.

“Ohanaeze  ga atule ma chọpụta usoro aga eji gbo mkpa IPOB nakwa ndi ọzọ na eme njaghari iwe ma kpezire ụmụ anyi na onwe anyi.,’’ ka okwuru.

Nwodo gakwara n’ihu kele ndi nile kwadoro ya site na itinyere ya akwụkwọ mọbu otu ụzọ na ụzọ ọzọ.

Na mbido, onye jibu okwa onye isi a bụ Chief Gary Enwo-Igariwey, kelere Ndigbo maka nkwado ha nyere ya mgbe ona achi ọchichi ya,ma gbakwunyekwa na ndi otu ya amalitela iwu isi ụlọ ọrụ ha putara nde kwuru ndee naria.

Enwo-Igariwey kwuru na ndi otu ya gbara mbọr ihu na enwere ezi mmekọrita di na etiti ndi gọọvernor ndi steti nile na asu Igbo n’ime afọ ano gara aga.

“Anyi nnọchitere anya ihe obula gbasara ndi Igbo na 2014 National Conference nke were onodu na Abuja ma were ohere a yoo ka emegharia ihe etu okwesiri,’’ ka okwuru.

Ndi ozo nwetara nmeri gunyere: Mazi Hilary Opara osote onye isi; Mazi Uche Okwukwu maka ode akwụkwọ ukwu na  Mazi Emeka Ogwu onye ojide ego.

Okwa iri na ato bu nke azoghi azo,ndia gunyere: Dr Solomon Ogunji osote ode akwụkwọ ukwu; Mazi Charles Odunukwe dika osote onye isi oche  Anambra; Dr Sylvester Ebigwei

SHARE

ENWEGHI OZI

NYE NZAGHACHI NYE