Gen.Olonisakin kwuru na ndi agha ala anyi ga esonyere ndi PCNI na iwoghachi udo

0
9

Ndi agha ala naijiria esonyela ndi Committee onye isi ala guzobere na mpaghara North-East nke nwa bekee kpọrọ  Presidential Committee on the North-East Initiative (PCNI),nke  oke na ọrụ ha bụ ijikọ aka ọnụ hu na ewetara udo na mpaghara the North-East.

Onye Chief of Defence Staff bụ Gen. Abayomi Olonisakin kwere nkwa na Abuja mgbe ndi ngalaba n’ahu maka nchekwa na iwu udo nke committee ndi PCNI biara zute ya.

Onye nnochitere ya bu  Air Vice Marshal Bashir Saidu bukwa onye n’ahu maka iweputa amuma na ihazi ihe.

Olonisakin kwuputatra njikere ndi agha njikọ aka ọnụ ha na ndi PCNI na ihe gbasara ibelata oke ntaram ahuhu nke ndi achụpuru na ebe ha nakwa iwughari ụlọ ha ndi emebiri.

O kwuru: “Ihe nile achọrọ bụ mmekọrita  na etiti ndi agha nótu aka, ndi otu committee na aka nke ozọr,ruo mgbe agha megide ndi nkusu ga abu nke enwetara nmeri.”

Onye isi ndi agha gbakwunyere nan di agha di nkwadobe ihụ na  udo loghachi azu,ma gwa ndi  committee a ka ha na aruko ọrụ ha na ndi agha ala anyi.

Na mbido,osote onye isi oche committee a bu Alhaji Tumsa toro ndi agha maka ikpochapu ndi  boko haram terrorists na ohia  Sambisa.

Ma gosi obi ụtọ ya na ntukwasi obi o nwere na ebe ndi agha ala anyi iweghachi udo azu na mpaghara North-East.

Tumsa kwuru na ibia hụ onye isi ndi agha so na amuma ndi otu PCNI nwere.

SHARE

ENWEGHI OZI

NYE NZAGHACHI NYE