Governor ugwuanyi ayola goomenti etiti ka ha leba anya na ngwa aku chinyere

0
25

Aka na achi steti Enugu bu Ifeanyi Ugwuanyi agwala gọọmenti etiti ka ha maanye ụlọ ọrụ nile enyere akwụkwọ ikikere igwuputa ngwa aku chinwere na ala Enugu, ka ha malite ọru mọbu anapu ha akwụkwọ ikikere (license).

O mere ka amata nkea mgbe ndi Revenue Mobilization Allocation and Fiscal Commission (RMAFC) n’aha nkpirisi,kpoturu ya na obi gọọmenti na Enugu.

Ma kwuputakwa na iji akwụkwọ ikikere ma hapu iji ya aru ọrụ ka enwere ike ikwusi,ma ọburu na enye ndi governor ohere isonye na inyocha ihe gbasara akwụkwọ ikikere igwuputa ihe n’ala.

Ma too gọọmenti etiti maka mbọr ha na agba iwughari ọnọdu akuluba ala anyi iji hu na adabereghi nani na nmanu ana egwuputa nala, Ugwuanyi kwuru na nkea ga ebuli ego ana enweta nakwa onodu akuluba gba gburu gburu ala anyi.

“Anyi ga asi na amuma di oke mkpa nye steti Enugu,dika steti nwere oke ubara ngwa aku chinyere,ma na enweta obere ihe site na ya,kama mgbe ulo oru Nigerian Coal Corporation na olu bekee mechiri site na omume n’ezighi ezi nke ndi nwere akwụkwọikikere ikwu coolu na steti a,”  onye gọvernọr kọwari nkea.

Owutere ya na oke ego na efunari alaka gọọmenti obula site na akwughi ego ndia kwesiri ikwunye na akpa gọọmenti nke gunyere ugwọ ana akwu kwa afọ,ugwọ ala nakwa ugwọ ndi ọzọ,ma yọọ ndi ụlọ nzukọ ome iwu ka ka ha leba anya ma mezie iwu banyere ngwa aku chinyere,ka nkea wee meek a oburu ndi steti gana ahu maka nkea.

Onye jigodu okwa dika onye isi oche Cọmmission bu, Engr Shettima Abba Gana, kwuru na njem a so na njem ha na eme gba gburu gburu ala anyi ileru anya na ụzọ ala anyi si enweta ego na ihe gbasara aku chinyer nke esi na ala egwuputa makwa etu esi arụ ya bu ọrụ.

O toro gọvernor Ugwuanyi maka otutu ọrụ mmepe ahutara na steti ya gba gburugburu,ma gwa ya ka ọguputasia aku chinyere nile nke di na steti Enugu ma ka ha deta akwụkwọ iyọọ ka enye ha akwụkwọ ikikere eji egwuputa ihe na ala.

Cọmmissioner nahu maka ihe di na ala na steti Enugu bu , Dr. Fidel Ayogu, kwuru na steti Enugu nwere ngwa aku chinyere nke ruru iri anon a ọnụ ọgugu, nke gunyere zink,otanjele,coal,iron,columbite na otutu ndi ọzọr.

SHARE

ENWEGHI OZI

NYE NZAGHACHI NYE