Minister n’ahu maka FCTakwala ndi ọrụ ọhaneze ka ha nelekota akọrọngwa gọọmenti

0
8

Onye Minister n’ahu maka Federal Capital Territory bụ Malam Muhammad Musa Belloagwala ndi n’ahu maka ọdi mma ọhaneze ka ha hụ na ana elekọta akọrọngwa gọọmenti etu okwesiri.

Malam Bello kwuputara nke a mgbe ọ na agbape ugbo ala iri atọ nke ndi uwe oji arughariri na Abuja.

Ugbo ala ndia arughariri nke putara ndee naira itolu nke gunyere otu ugbo ala eji ebu mmiri maka ichusa otutu mmadu,ugbo ala abuo nke akpọrọ  Armoured Personnel Carriers na olu bekee,otu ugbo ala  gwongworo, Toyota Hilux Jeeps iri abuo na otu nakwa ugbo ala Toyota Corolla ise.

Mallam Bello kwuru na ego eji mezie ụgbọ ala nile a erughi ego aga eji zuta otu ụgbọ ala Toyota Hilux na ala anyi.

Onye Minister FCT a kọwari na onye Commissioner ndi uwe oji nke FCT bụ Muhammad Mustafa dika onye uwe oji purụ iche nke kwesiri ka enye aha ya maka ọkwa di elu.

Ma gbakwunyekwa na“omume di etua bụ udi mgbanwe nke onye isi ala bụ Muhammadu Buhari na ekwu maka ya, maka anyi iyocha obodo a,anyi ga alaghachi azu inọ na aruzi ihe bụ nke anyi kwusigoro”. 

Mallam Bello nọrọ ala ya na commissioner ndi uwe oji na FCT wee kparia ụka banyere ihụ na ndi uwe oji na agaghari etu okwesiri,ebe ogwara ha na FCTA agaghi azutanwu ụgbọ ala ọhụrụ maka ndi uwe oji ugbua kama kpebie na ọ ga enyefe ego di ndee naira itoolu ka eji ruzie ụgbọ ala ndi mebiri emebi bụ ndi nke aga emezinwu.

O gakwara n’ihu kwe nkwa na ebe ha mere nkea na ozo na abia ga abu iwughari ulo oru ndi uwe oji nile di na Federal Capital Territory,ma were ohere a ndi isi ndi uwe oji ka wube ogige ebe ana aruzi ugbo ala dika odi na mbu nan kea ga agbanwe onodu.

Dr.Babatope Ajakaiye kelere onye minister na Permanent Secreary nke FCT ebe Commissioner ndi uwe oji na FCT bu Muhammad Mustafa kwuputara obi uto ya maka ndee naira itolu o nyere ha.

Onye commissioner ndi uwe oji a kwuru na ndi  Chinese Embassy nyere ha otu ugbo ala Honda ma ego di otu ndee naira iji na edozi ya.

SHARE

ENWEGHI OZI

NYE NZAGHACHI NYE