ONYE BỤBU ONYEISIALA NAIJIRỊA AGWALA ỤMỤAFỌ ALA NAIJIRỊA KA HA KWADOO NDỊ UWE OJII

0
22

Arịọla ndi otu okpukperechi, ndị ndu obodo na otu ndị kwụụrụ onwe ha n’ ala Naijiria ka ha kwadoo ndi uwe ojii.

Nkwado ahụ ga enye aka irụ ọrụ nke ọma dịka iwu si wee kwuo.

Onye bụbu onyeisiala n’ala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo kwuru nke a n’ ọgbakọ e ji agbape atụmatụ “mgbanwe ga- ebido n ebe m nọ”,  nke ụlọọrụ ndị uwe ojii steeti Ogun haziri n’ Abeokuta.
E mere ka a mata na ihe e jiri chịkọba ọgbakọ ahụ bụ inwete echiche obi ndị ma chọpụta ụzọ kacha mma a ga- eji chekwawa ndụ na akụ ndi mmadụ

Onye jibu ọkwa onyeisiala ahụ gwakwara ụmụafọ ala Naijiria ka ha na- enye ndi uwe ojii ozi ndị dị mkpa iji nyere ha aka ibelata ogo enweghị ezi nchekwa n’ ala Naijiria.

Dika o si wee kwuo, ichekwa obodo bụ ọrụ siri ike nke chọrọ njikọ aka nke onye ọbụla.

Obasanjo mechakwara kwuo na oge eruola mgbe ụmụafọ ala Naijirịa ga- enyere ndi isi ọchịchị uwe ojii aka na mbọ ha ikpochapụ mpụ n’ ala Naijiiria.

Aka na- achi steeti Ogun bụ Ibikunle Amosun kwuru na ndị mmadụ enweghịzi ntụkwasiobi n’ ebe ndị uwe ojii nọ.

Ọ rịọkwara ndi isi ndi uwe ojii ka ha mee ihe niile ha nwere ike iji weghachite ntụkwasiobi ndi mmadụ n’ ebe ha nọ

Amosun kwekwara nkwa na ọchịchị ya agaghi ele anya n’azụ ikwado ndi uwe ojii nakwa ndi ọrụ nchekwa ndi ọzọ n’ ọrụ ha ichekwawa obodo.

Ọ rịọkwara ndi uwe ojii ka ha hu na echekwawara ndị mmadu na- ewetere ha ozi

Onyeisi ndi uwe ojii na steeti Ogun bụ Ahmed Iliyasu kwunwekwara na ndi uwe ojii ga -emejuputa ihe ndi a chọrọ n’ aka ha n’atụmatụ mgbanwe ga ebido n’ ebe m nọ ahụ.

Chizoba Anuforom

 

SHARE

ENWEGHI OZI

NYE NZAGHACHI NYE