Otu APC agbanwela onye ndu ndi senate

0
10

Otu ndọrọ ndọrọ na achi achi nke akpọrọ All Progressives Congress (APC) na aha ichafu n’ụlọ nzukọ omeiwu senate akpọlitela Senator Ahmed Lawan dika onye ṅdu ọhuru.

Senator Lawan bu onye nnochiri  Senator Ali Ndume dika onye ṅdu ndi kachasi n’ọnụ ọgụgụ,nke a gbakwasieri ụkwụ na ihe emetara na bụ ndi ọnụ na eru n’okwu na parti APC.

Na akwụkwọ ha degara ndi ụlọ nzụkọ senate nke onye hụrụ maka ya ma gụpụtakwa ya bụ  Dr. Bukola Saraki kwuru“Nke a iji mee ka ụnụ bụ ndi senate mara na,dika anyi nwechara nzụkọ na ụbọchi  Mọndee bụ abali itolu nke ọnwa mbu nke afọ puku abụọ na iri na asa, dika anyi nwechara ntule na njuta ndi ọnụ na eru na okwu na otu APC na senate,anyi ji ohere a na eme ka unu mara na enwela mgbanwe nke onye ndu ọhụrụ bụ Ahmed Lawan na anochite anya mpaghara  Yobe north Senatorial district nke steti Yobe.”

Na nzaghachi okwu a,Senator Ndume kwuru na ya amaghi maka mgbanwe a.

“Amaghi m na enwere mgbanwe n’ihi na anoghim ya,agara m ikpe ekpere ọbụ ya mere amaghi ihe ọbula mere,agaghi ekwu okwu ọtụtụ okwu banyere nkea,” ka okwuru.

 

SHARE

ENWEGHI OZI

NYE NZAGHACHI NYE