TAA BỤ ỤBỌCHI TUUZDE MA BỤRỤKWA AHIA ORIE ABALI IRI ABỤỌ NA ITOOLU NKE ỌNWA NOVEMBA AFỌ PUKU ABỤỌ NA IRI NA ISII. Otu jikọrọ ndị aka na- achi steeti dị iche iche na mgbago ụgwu ala Naijiria na ụlọọrụ mgbanwu ọkụ a kpọrọ General Electric International Company ebinyela aka n’akwụkwọ nkwekọrita maka irụ igwe ji anyanwụ agbanwu ọkụ n’ụfodụ ebe na mpaghara ahụ.

0
15

Otu jikọrọ ndị aka na- achi steeti dị iche iche na mgbago ụgwu ala Naijiria na ụlọọrụ mgbanwu ọkụ a kpọrọ General Electric International Company ebinyela aka n’akwụkwọ nkwekọrita  maka irụ igwe ji anyanwụ agbanwu ọkụ n’ụfodụ ebe na mpaghara ahụ.

Ozi ha wepụtara na -ekwu na ebumnobi ya bụ atụmatụ ọrụ bụ iji kwalite ọnọdụ akụnaụba nakwa ihe e ji enyere ndụ aka na steeti ndị o metutara.

Ya bụ atụmatụ ọrụ ga- akwalite iji ihe ndị akọpụtara n’ugbo na- emepụta ihe erimeri di iche iche, ịkwalite ụmụ obere azumahia nakwa inye ụlọ akwụkwọ na ụlọọgwụ ọkụ latrik.

Onyeisi otu jikọrọ ndị aka na-achi steeti mgbago ụgwu ala Naijiria ma bụrụkwa aka na- achi Steeti Borno, bụ Kashim Shettima binyere aka n’akwụkwọ nkwekọrita a n’aha ndi otu ya, ebe Maazi Armand Pineda, bu onye na- elekọta mpaghara ọdida anyanwụ mba Europe na mba Afrika nakwa onyeisi ụlọọrụ General Electric Nigeria bụ dokinta Lazarus Angbazo binyere aka n’aha ụlọọrụ ha na mmemme ahụ e mere n’Abuja.

Ebumnobi ya bụ nkwekọrita bụ irụpụta igwe ji anyanwụ enweta ọkụ di nari megawatt ise.

Site na ya bụ nkwekọrita, ụlọọrụ General Electric ga -arụpụta igwe ọkụ ise nke ga- adi  na steeti ise ndi gụnyere Borno, Kebbi, Nassarawa, Niger nakwa steeti Taraba, dika a tụrụ anya na igwe ndi a ga na -enweta ọkụ di otu nari megawatt.
Aka na- achị steeti ndị a kwuputara mkpa ọ dị iji ụlọọrụ ahụ rụọ ya bụ ọrụ maka na ha arụzuọla ọrụ afọ iri ise n’ala Naijiria

Shettima kwuru na ha ga -arụ ọrụ ha dika ndi gọvanọ na steti ha di iche iche.

Ọ gụpụtara ihe ndi na- echere ha aka mgba dika, ụbiam, enweghi ọrụ, enweghi ohere maka ezi ọnọdụ agumakwụkwọ, enweghi ezi nlekọta ọnọdụ ahụike nakwa ihe ndi ọzọ na mpaghara a.

Maazi Armand Pineda bu onye na- elekọta mpaghara ọdida anyanwụ mba Europe na mba Afrika nakwa onyeisi ụlọọrụ General Electric Nigeria bụ dokinta Lazarus Angbazo kwere nkwa na ha ga- arụ ya bụ ọrụ nke ọma maka odima ụmụafọ stetei ndi a.

Oluoma

SHARE

ENWEGHI OZI

NYE NZAGHACHI NYE