mba saudi arabia anwuchiela mmadu asato ana enyo-enyo

0
30

Mba Saudi Arabia anwuchiela mmadu asatọ ana enyo-enyo na ha so na di agha nkusu asi na ọ bu ha gbusiri ndi mmadu ma tuo ogbunigwe na  otu ugbo ala,onye miniter n’ahu maka ihe na eme n’obodo ahu kwuru nke a n’ubochi uka,ebe akana achukwa  ndi ozo aka ha di na ya.

Onye miniter mere ka amata na ndia anwuchiri gunyere otu onye alakuba ana enyo-enyo na obu ya gbusiri ndi oru nche na mpaghara  Shaqra district nke mgbago ugwu isi obodo Riyadh.

Ndi agha nkusu ozo akpala ekete ibu agha megide ndi nkiti na mpaghara owuwa anyanwu Qatif ma kwado itu ogbunigwe na ugbo ala otu egwu bolu ndi mba United Arab Emirates (UAE) na ama egwuri egwu di na odida anyanwu nke Jeddah, ka okwuputara.

O kwuru na mmadu asato a  ana enyo-enyo anwuchiri,gunyere mmadu abuo bu ndi pakistanis,otu onye  Syrian na otu onye Sudan. Mmadu asatoo ozo bu ndi mba Saudi nakwa otu onye obodo Bahraini sokwa na di ana acho acho ka noo na oso.

Chidi igwe

 

SHARE

ENWEGHI OZI

NYE NZAGHACHI NYE